Loading Bible Translation
First-time download in progress. This may take a few seconds…
Igbo Holy Bible Wordproject Bible
11 verses
1Nyenu Jehova, unu umu Chineke, Nyenu Jehova nsọpuru na ike.
2Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya; Kpọnu isi ala nye Jehova n'ima-nma nke idi-nsọ.
3Olu Jehova di n'elu miri: Chineke nke ebube nāma éb͕è-elu-igwe, Jehova nọ n'elu ọtutu miri.
4Olu Jehova nāda n'ike; Olu Jehova nāda n'ima-nma.
5Olu Jehova nētiwa osisi cedar; Jehova we tiwasia osisi cedar nke Lebanon.
6Ọ nēme ka ha nāwuli elu dika nwa-ehi; Bú Lebanon na Siron, dika nwa-atu.
7Olu Jehova nāwaputa ire ọku.
8Olu Jehova nēme ka ọzara me nkpatu; Jehova nēme ka ọzara Kedesh me nkpatu.
9Olu Jehova nēme ka ime nēme nne-ele, Ọ nāb͕uchapu kwa akwukwọ osisi oké ọhia: Ọzọ n'ulo uku Ya ihe hile nāsi, Ebube.
10Jehova nọduru n'oche-eze n'Iju-miri ahu; Jehova we nọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi.
11Jehova gēnye ndi-Ya ike; Jehova gēji udo gọzie ndi-Ya.