Loading Bible Translation
First-time download in progress. This may take a few seconds…
Igbo Holy Bible Wordproject Bible
9 verses
1Gini mere i nēto onwe-gi n'ihe ọjọ, gi dike? Ebere Chineke nādigide ogologo ubọchi nile.
2Ihe-ila-n'iyì di iche iche ka ire-gi nēchè; Dika aguba di nkọ, nālu ọlu aghughọ.
3I huwo ihe ọjọ n'anya kari ezi ihe; Na okwu-ugha kari ikwu okwu ezi omume. Selah
4I huwo okwu nile nēloda eloda n'anya, Gi ire aghughọ.
5Chineke gākwatu kwa gi rue mb͕e ebighi-ebi, Ọ gējide gi, dọkpupu gi n'ulu-ikwū-gi, Ropu kwa gi n'ala ndi di ndu. Selah
6Ndi ezi omume gāhu kwa ya we tua egwu, Chì kwa ya ọchi, si,
7Le, nwoke nke nādighi-eme Chineke ebe-ya siri ike; Kama ọ tukwasiri obi n'uba nke àkù-ya, Ọ di ike n'ọchichọ ọjọ ya.
8Ma mu onwem, adim ka osisi olive nwere akwukwọ ndu n'ulo Chineke: Atukwasiwom obi n'ebere Chineke rue mb͕e nile ebighi-ebi.
9M'gēkele Gi rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na I meworo ya: M'gēle kwa anya aha-Gi, n'ihi na ọ di nma, niru ndi-ebere-Gi.