Loading Bible Translation
First-time download in progress. This may take a few seconds…
Igbo Holy Bible Wordproject Bible
17 verses
1Naputam n'aka ndi-irom, Chinekem: Me ka m'si n'aka ndi nēbili imegidem nọ n'ebe di elu.
2Naputam n'aka ndi nālu ajọ ihe, Zọputakwam n'aka ndi-ọbara.
3N'ihi na, le, ha echewo nkpuru-obim anwu; Ndi di ike nēzukọ imegidem: Ọ bughi n'ihi njehiem, ọ bughi kwa n'ihi nmehiem, Jehova.
4Mb͕e ọ nādighi ajọ omume m'mere ha nāb͕a ọsọ, dozie onwe-ha: Kpọte Onwe-gi izutem, hu kwa.
5Gi onwe-gi kwa, Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, Teta ileta mba nile: Emelera ndi nāghọ aghughọ n'ajọ ihe amara. Selah
6Ha nālaghachi n'anyasi, nāb͕ọ uja dika nkita, Nāga obodo buruburu.
7Le, ha ji ọnu-ha nāsuputa okwu; Mma-agha di n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha: N'ihi na ònye nānu? bu ihe ha kwuru.
8Ma Gi onwe-gi, Jehova, gāchì ha ọchì; I gākwa mba nile emò.
9Ikem, Gi ka m'gēlezi anya: N'ihi na Chineke bu ulo-elum.
10Chineke nke eberem gābia izutem: Chineke gēme ka m'lekwasi ndi nēchem anwu anya.
11Eb͕ula ha, ka ndim ghara ichezọ: Were usu-ndi-agha-Gi me ka ha nāṅaghari, me kwa ka ha rida, Onye-nwe-ayi, bú ọta-ayi.
12Nmehie nke ọnu-ha ka okwu nke eb͕ub͕ere-ọnu-ha bu; Ka anwude kwa ha nime npako-ha, Na n'ihi ọb͕ub͕a-iyi na n'ihi okwu-ugha nke ha nākọ akukọ-ha.
13Me ka ha gwusia n'ọnuma-Gi, me ka ha gwusia, ka ha ghara idi ọzọ: Ka ha mara kwa na Chineke nāchi achi nime Jekob, Rue nsọtu nile nke uwa. Selah
14Ha nālaghachi kwa n'anyasi, nāb͕ọ uja dika nkita, Nāga obodo buruburu.
15Ndi ahu nāṅaghari iri ihe, Ọ buru na afọ ejughi ha ha gānọ kwa ọnọdu-abali.
16Ma mu onwem gābù abù bayere ike-Gi; E, m'gēti nkpu ọṅù bayere ebere-Gi n'ututu: N'ihi na I buruworom ulo-elu, Na ebe-nb͕alaga n'ubọchi nkpab͕u dirim.
17Ikem, Gi ka m'gābùku abù ọma: N'ihi na Chineke bu ulo-elum, bú Chineke nke eberem.