Loading Bible Translation
First-time download in progress. This may take a few seconds…
Igbo Holy Bible Wordproject Bible
7 verses
1Ntọ-ala-Ya di n'ugwu nsọ nile.
2Jehova nāhu ọnu-uzọ-ama nile nke Zaion Kari ebe-obibi nile nke Jekob.
3Ihe di iche iche nke di nsọpuru ka anēkwu bayere gi, Obodo Chineke. Selah
4M'gēhota Rehab na Babilon, na ha di n'etiti ndi maram: Le Filistia na Taia, ha na Etiopia; Nka ka amuru n'ebe ahu.
5Ọ bu kwa Zaion ka agēkwu okwu bayere ya, si, Onye na onye ọ bula ka amuru nime ya; Ọzọ, Ya onwe-ya, bú Onye kachasi ihe nile elu, gēme ka o guzosie ike.
6Jehova gāgu, mb͕e O ji de ndi nile di iche iche n'akwukwọ, si, Nka ka amuru n'ebe ahu. Selah
7Ma ndi nābù abù ma ndi nēte egwú, ha nile gāsi, Isi-iyim nile di na Gi.