Loading Bible Translation
First-time download in progress. This may take a few seconds…
Igbo Holy Bible Wordproject Bible
9 verses
1Jehova bu eze; ka ndi nile di iche iche ma jijiji: Ọ nēbi n'etiti cherubim; ka uwa me nkpatu.
2Jehova di uku nime Zaion; Onye di elu ka Ọ bu kwa n'elu ndi nile di iche iche.
3Ka ha kele aha-Gi nke di uku, nke anātu kwa egwu ya: Onye nsọ ka Ọ bu.
4Ike nke eze nāhu kwa ezi ikpé n'anya Gi onwe-gi emewo ka izi-ezi guzosie ike, Ezi ikpé na ezi omume ka Gi onwe-gi meworo nime Jekob.
5Bulienu Jehova, bú Chineke-ayi, elu, Kpọ-kwa-nu isi ala n'ebe ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya di: Onye nsọ ka Ọ bu.
6Moses na Eron n'etiti ndi-nchu-àjà-Ya, Samuel kwa n'etiti ndi nākpọku aha-Ya Ha nākpọku Jehova, Ya onwe-ya we za ha.
7N'ogidi igwe-oji ka Ọ nāgwa ha okwu: Ha debere ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru O nyere ha.
8Jehova, bú Chineke-ayi, Gi onwe-gi zara ha: Chineke Nke nēbupu nmehie ka I buru ha, Ma I bu onye nābọ̀ ọ́bọ̀ omume nile ha,
9Bulienu Jehova, bú Chineke-ayi, Kpọ-kwa-nu isi ala n'ebe ugwu nsọ Ya di; N'ihi na onye nsọ ka Jehova, bú Chineke-ayi, bu.